Ndị Kọlọsị 3

Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa.

Colossians 3:2 (UKJV) Set your affection on things above, not on things on the earth.

1Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke.

2Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa.

3Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst.

4Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.