Ndị Kọlọsị 3

Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya.

Colossians 3:4 (UKJV) When Christ, who is our life, shall appear, then shall all of you also appear with him in glory.

2Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa.

3Nʼihi na unu anwụọla. E zokwara ndụ unu nʼime Chineke site na Kraịst.

4Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya.

5Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).

6Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.