Ndị Kọlọsị 3

Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi.

Colossians 3:6 (UKJV) For which things' sake the wrath of God comes on the children of disobedience:

4Mgbe Kraịst onye bụ ndụ unu ga-apụta ihe, unu ga-esokwa ya pụta ìhè nʼebube ya.

5Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).

6Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi.

7Ihe ndị a bụ ihe unu na-eme nʼoge gara aga mgbe unu na-adị ndụ nʼime ha.

8Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.