12Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha.
13Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa.
14Ugbu a, abịala m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị nʼoge ikpeazụ nʼụbọchị dị nʼihu. Nʼihi na ọhụ ndị a dịrị oge ndị na-abịa nʼihu.”
15Mgbe ọ na-agwa m okwu ndị a, ekpunyere m ihu m nʼala enwekwaghị m ike ikwu okwu ọbụla.
16Mgbe ahụ, otu onye, nke yiri mmadụ, bịara metụ egbugbere ọnụ m aka, mee ka m nwee ike ikwukwa okwu ọzọ. Mgbe ahụ agwara m onye ahụ nke guzo m nʼihu, “Anọ m nʼoke ihe mgbu; Onyenwe m, enwekwaghị m ike ọbụla, nʼihi ọhụ m hụrụ.