28Ọ ga-eji akụnụba dị ukwuu laghachi nʼobodo nke ya ma obi ya ga-adị imegide ọgbụgba ndụ nsọ ahụ. Ọ ga-ebili imegide ya ma mesịa laghachi nʼobodo nke aka ya.
29“Ma mgbe oge ahụ a kara aka ruru, ọ ga-achịrịkwa ndị agha ya laghachi na ndịda, ma ihe agaghị adị otu ọ dị na mbụ.
30Ụgbọ mmiri ndị si obodo Kitim ga-abịa imegide ya, ọ ga-ada mba nʼihi egwu, ọ ga-alaghachi azụ were oke iwe megide ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ. Ọ ga-alọghachi gosi ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ nkwado.
31“Ndị agha ya ga-ebili imerụ ebe ahụ e wusiri ike nke ụlọnsọ ukwu ahụ, kwụsịkwa aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị. Ha ga-ewuli ihe arụ nke na-eweta mbibi.
32Ọ ga-eji ire ụtọ merụọ ndị ahụ mebiri iwu nke ọgbụgba ndụ. Ma ndị ahụ maara Chineke ha ga-adị ike guzogide ya.