Daniel 11

Ọ ga-eji ire ụtọ merụọ ndị ahụ mebiri iwu nke ọgbụgba ndụ. Ma ndị ahụ maara Chineke ha ga-adị ike guzogide ya.

Daniel 11:32 (UKJV) And such as do wickedly against the covenant shall he corrupt by flatteries: but the people that do know their God shall be strong, and do exploits.

30Ụgbọ mmiri ndị si obodo Kitim ga-abịa imegide ya, ọ ga-ada mba nʼihi egwu, ọ ga-alaghachi azụ were oke iwe megide ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ. Ọ ga-alọghachi gosi ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ nkwado.

31“Ndị agha ya ga-ebili imerụ ebe ahụ e wusiri ike nke ụlọnsọ ukwu ahụ, kwụsịkwa aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị. Ha ga-ewuli ihe arụ nke na-eweta mbibi.

32Ọ ga-eji ire ụtọ merụọ ndị ahụ mebiri iwu nke ọgbụgba ndụ. Ma ndị ahụ maara Chineke ha ga-adị ike guzogide ya.

33“Ndị niile nwere uche ga-ezi ọtụtụ mmadụ ihe, ma na nwa oge nta, ụfọdụ ga-anwụ site na mma agha, ụfọdụ ka a ga-akpọ ọkụ, ụfọdụ ka a ga-adọta nʼagha, ụfọdụ kwa ka a ga-apụnara ihe ha nwere.

34Mgbe ha ga-ada, inyeaka ntakịrị ga-abịara ha, ọtụtụ ndị mmadụ ga-ejikwa ụzọ aghụghọ bịa dịnyere ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.