34Mgbe ha ga-ada, inyeaka ntakịrị ga-abịara ha, ọtụtụ ndị mmadụ ga-ejikwa ụzọ aghụghọ bịa dịnyere ha.
35Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị maara ihe ga-asọ ngọngọ, ka ha nwe ike bụrụ ndị a nụchara anụcha, na ndị a sachapụrụ ọcha na ndị emere ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ tutu ruo nʼọgwụgwụ ihe ndị a, nʼihi nʼoge ahụ ga-abịa mgbe akara aka.
36“Eze ahụ ga-eme ihe ọbụla ọ chọrọ. Ọ ga-agụkwa onwe ya dịka onye dị ukwuu karịa chi niile. Nʼezie, ọ ga-ekwu okwu nkwulu megide Chineke kachasị chi niile. Ma ihe ga-agakwara ya nke ọma tutu mgbe oge ya zuru. Nʼihi na ihe niile ekwuru ga-emezucha.
37Ọ gaghị akpọ chi nke nna ha maọbụ nke ahụ ụmụ nwanyị na-achọsi ike ihe ọbụla, o nweghị chi ọbụla ọ ga-akpọ ihe nʼihi na ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa ha niile.
38Kama chi nke ọ ga-asọpụrụ bụ chi nke ebe e wusiri ike, chi nke nna ya ha na-amaghị. Ọ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, na nkume dị oke ọnụahịa na onyinye dara oke ọnụahịa fee chi a.