Daniel 11

Ọ gaghị akpọ chi nke nna ha maọbụ nke ahụ ụmụ nwanyị na-achọsi ike ihe ọbụla, o nweghị chi ọbụla ọ ga-akpọ ihe nʼihi na ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa ha niile.

Daniel 11:37 (UKJV) Neither shall he regard the God of his fathers, nor the desire of women, nor regard any god: for he shall magnify himself above all.

35Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị maara ihe ga-asọ ngọngọ, ka ha nwe ike bụrụ ndị a nụchara anụcha, na ndị a sachapụrụ ọcha na ndị emere ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ tutu ruo nʼọgwụgwụ ihe ndị a, nʼihi nʼoge ahụ ga-abịa mgbe akara aka.

36“Eze ahụ ga-eme ihe ọbụla ọ chọrọ. Ọ ga-agụkwa onwe ya dịka onye dị ukwuu karịa chi niile. Nʼezie, ọ ga-ekwu okwu nkwulu megide Chineke kachasị chi niile. Ma ihe ga-agakwara ya nke ọma tutu mgbe oge ya zuru. Nʼihi na ihe niile ekwuru ga-emezucha.

37Ọ gaghị akpọ chi nke nna ha maọbụ nke ahụ ụmụ nwanyị na-achọsi ike ihe ọbụla, o nweghị chi ọbụla ọ ga-akpọ ihe nʼihi na ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa ha niile.

38Kama chi nke ọ ga-asọpụrụ bụ chi nke ebe e wusiri ike, chi nke nna ya ha na-amaghị. Ọ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, na nkume dị oke ọnụahịa na onyinye dara oke ọnụahịa fee chi a.

39Ọ ga-emegide ebe niile e wusiri ike, nke siri ike site nʼinyeaka chi nke mba ọzọ. Ndị niile nabatara ya ka ọ ga-eme ka nsọpụrụ bara ụba. Ọ ga-eme ha ndị ọchịchị ọtụtụ mmadụ, kenyekwa ha ala dịka ụgwọ ọrụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.