18Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn.
19Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe,
20Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya.
21Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma.
22Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya.