19Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe,
20Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya.
21Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma.
22Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya.
23Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha, nʼihi na i nyela m amamihe na ike. I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị, i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.”