Daniel 4

“Nke a bụ nrọ ahụ, mụ bụ eze Nebukadneza rọrọ, ugbu a, Belteshaza, gwa m ihe bụ nkọwa ya. Nʼihi na ndị amamihe niile nọ nʼalaeze m enweghị ike ịkọwara m ya. Ma amaara m na i nwere ike ịkọwara m ya, nʼihi na mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ dị nʼime gị.”

Daniel 4:18 (UKJV) This dream I king Nebuchadnezzar have seen. Now you, O Belteshazzar, declare the interpretation thereof, forasmuch as all the wise men of my kingdom are not able to make known unto me the interpretation: but you are able; for the spirit of the holy gods is in you.

16Ka uche ya gbanwee ghọọ nke anụ ọhịa, ghara ibu nke mmadụ, afọ asaa.

17“ ‘Nke a bụ mkpebi nke mmụọ ozi ahụ nọ na nche. Ọ bụkwa mkpebi e nyere site nʼokwu nke dị nsọ, ka ụwa niile mata na Onye kachasị ihe niile elu, na-achịkwa nʼalaeze niile dị nʼụwa. Ọ bụ ya na-ewerekwa alaeze ndị a nye onye ọbụla ọ chọrọ, ọ bụladị ndị mmadụ a na-ahụta dịka ndị dị ala karịsịa.’

18“Nke a bụ nrọ ahụ, mụ bụ eze Nebukadneza rọrọ, ugbu a, Belteshaza, gwa m ihe bụ nkọwa ya. Nʼihi na ndị amamihe niile nọ nʼalaeze m enweghị ike ịkọwara m ya. Ma amaara m na i nwere ike ịkọwara m ya, nʼihi na mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ dị nʼime gị.”

19Mgbe ahụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), nọ nʼoke ihe iju anya nʼihi na echiche ya mere ka ọma jijiji. Ya mere, eze sịrị, “Belteshaza, atụkwala egwu nʼihi nrọ a maọbụ ihe ọ pụtara.” Belteshaza zara sị, “Onyenwe m, ka nrọ a dịrị ndị kpọrọ gị asị, ka nkọwa ya dịkwara ndị iro gị.

20Osisi ahụ ị hụrụ nke buru ibu, tokwa ogologo ma dịkwa ike, nke elu ya na-emetụ mbara eluigwe, nke ndị niile bi nʼụwa hụrụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.