18“Nke a bụ nrọ ahụ, mụ bụ eze Nebukadneza rọrọ, ugbu a, Belteshaza, gwa m ihe bụ nkọwa ya. Nʼihi na ndị amamihe niile nọ nʼalaeze m enweghị ike ịkọwara m ya. Ma amaara m na i nwere ike ịkọwara m ya, nʼihi na mmụọ nke chi ndị ahụ dị nsọ dị nʼime gị.”
19Mgbe ahụ Daniel (onye a na-akpọkwa Belteshaza), nọ nʼoke ihe iju anya nʼihi na echiche ya mere ka ọma jijiji. Ya mere, eze sịrị, “Belteshaza, atụkwala egwu nʼihi nrọ a maọbụ ihe ọ pụtara.” Belteshaza zara sị, “Onyenwe m, ka nrọ a dịrị ndị kpọrọ gị asị, ka nkọwa ya dịkwara ndị iro gị.
20Osisi ahụ ị hụrụ nke buru ibu, tokwa ogologo ma dịkwa ike, nke elu ya na-emetụ mbara eluigwe, nke ndị niile bi nʼụwa hụrụ,
21nke nwekwara akwụkwọ ndụ dị mma, na nke jupụtara na mkpụrụ, nke na-egboro mmadụ niile mkpa nri, nke ụmụ anụmanụ ọhịa niile na-ebi nʼokpuru ndo ya, nke ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe nwere akwụ ebe obibi ha,
22osisi ahụ bụ gị onwe gị, eze. Nʼihi na i toola bụrụ onye dị ike na onye dị ukwuu. Ịdị ukwu gị eruola nʼeluigwe. Ọchịchị gị eruokwala nʼakụkụ niile nke ụwa.