Daniel 4

Mgbe ọnwa iri na abụọ gafesịrị ọ nọ na-agagharị nʼelu ụlọ dị nʼụlọeze nʼobodo Babilọn.

Daniel 4:29 (UKJV) At the end of twelve months he walked in the palace of the kingdom of Babylon.

27Ya mere, biko eze, kweere nabata ndụmọdụ m, kwụsị ime mmehie, mee ihe ziri ezi, werekwa omume ileta ndị ogbenye dochie nʼọnọdụ ajọ omume gị. Eleghị anya, ihe ga na-agara gị nke ọma.”

28Ma ihe ndị a niile bịakwasịrị eze Nebukadneza.

29Mgbe ọnwa iri na abụọ gafesịrị ọ nọ na-agagharị nʼelu ụlọ dị nʼụlọeze nʼobodo Babilọn.

30Ma eze sịrị, “Ebe a, ọ bụghị Babilọn dị ukwu, nke m wuuru onwe m dịka ebe obibi m, site nʼike m dị ukwu na maka ebube ọchịchị m?”

31Mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, otu olu si nʼeluigwe kwuo okwu, “Ihe a ka e kpebiri megide gị, eze Nebukadneza. Site taa gaa nʼihu ị gaghị abụkwa eze na-achị alaeze a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.