28Ma ihe ndị a niile bịakwasịrị eze Nebukadneza.
29Mgbe ọnwa iri na abụọ gafesịrị ọ nọ na-agagharị nʼelu ụlọ dị nʼụlọeze nʼobodo Babilọn.
30Ma eze sịrị, “Ebe a, ọ bụghị Babilọn dị ukwu, nke m wuuru onwe m dịka ebe obibi m, site nʼike m dị ukwu na maka ebube ọchịchị m?”
31Mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, otu olu si nʼeluigwe kwuo okwu, “Ihe a ka e kpebiri megide gị, eze Nebukadneza. Site taa gaa nʼihu ị gaghị abụkwa eze na-achị alaeze a.
32A ga-esi nʼetiti ndị mmadụ chụpụ gị, ka ị gaa soro ụmụ anụmanụ biri nʼọhịa. Ị ga-atakwa ahịhịa dịka oke ehi, afọ asaa ga-agasị tutu ruo mgbe ị ghọtara na ọ bụ Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze dị niile nke ụwa. Ọ na-enyefekwa ha nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ chịa.”