19Nʼìhè mbụ nke ụtụtụ, mgbe chị na-abọ, eze biliri mee ngwangwa, gaa nʼolulu ọdụm ahụ.
20Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?”
21Ya mere, Daniel sịrị eze, “Eze, dịrị ndụ ruo mgbe niile!
22Chineke m zitere mmụọ ozi ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a, ka ha si otu a hapụ inwe ike ịmetụ m aka, nʼihi na Chineke maara na aka m dị ọcha. Ọ makwaara na o nweghị ihe ọbụla m mere mejọọ gị.”
23Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.