19Onyenwe anyị nụrụ! Onyenwe anyị, gbaghara anyị! Onyenwe anyị biko, gee ntị ma zaa anyị. Nʼihi aha gị, O Chineke m, anọkwala ọdụ, nʼihi obodo gị, na ndị nke gị bụ aha gị ka a na-akpọ ha.”
20Mgbe m nọ na-ekwu okwu na-ekpe ekpere, na-ekwupụta mmehie m na mmehie ndị m Izrel, na-arịọkwa amara nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke m maka ugwu dị nsọ nke Chineke m,
21ebe m ka nọ na-ekpere, Gebrel, nwoke ahụ m hụrụ nʼọhụ na mbụ, feere ọsịịsọ bịakwute m nʼoge a na-achụ aja nke uhuruchi.
22Ọ bịara sị m, “Daniel, a bịara m ugbu a inye gị uche na nghọta.
23Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a.