Daniel 9

Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a.

Daniel 9:23 (UKJV) At the beginning of your supplications the commandment came forth, and I am come to show you; for you are greatly beloved: therefore understand the matter, and consider the vision.

21ebe m ka nọ na-ekpere, Gebrel, nwoke ahụ m hụrụ nʼọhụ na mbụ, feere ọsịịsọ bịakwute m nʼoge a na-achụ aja nke uhuruchi.

22Ọ bịara sị m, “Daniel, a bịara m ugbu a inye gị uche na nghọta.

23Na mbido oge ị malitere ịrịọ arịrịọ, ka okwu ọsịsa pụtara. Abịara m ịgwa gị ya, nʼihi na ị bụ onye a na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ya mere, tụgharịa uche nʼokwu a, ghọtakwa ọhụ a.

24“Iri izu ụka asaa, ka e dere nʼiwu nye ndị gị na obodo nsọ gị iji kwụsị njehie, ime ka mmehie kwụsị, na ịchụ aja maka ikpuchi ajọ omume na iweta ezi omume nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi, na ịkachi ọhụ na amụma ahụ akara, nakwa ite Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmanụ.

25“Ma mara, werekwa uche ghọta nke a: Site nʼoge e nyere iwu ka e wugharịa Jerusalem tutu ruo mgbe Onye ahụ e tere mmanụ, onyendu ahụ ga-abịa, ga-abụ izu ụka asaa, na izu ụka iri isii na abụọ, a ga-ewughachi ya, na okporoụzọ ya, na olulu mmiri ya, maọbụ nʼime oge nsogbu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.