Daniel 9

Nʼihi nke a, echere m Onyenwe anyị Chineke ihu, rịọ ya arịrịọ, site nʼekpere na arịrịọ amara, nʼibu ọnụ, na iyikwa akwa mkpe na ntụ.

Daniel 9:3 (UKJV) And I set my face unto the Lord God, to seek by prayer and supplications, with fasting, and sackcloth, and ashes:

1Nʼafọ mbụ, nke Daraiọs nwa Ahasuerọs (onye agbụrụ Midia), onye e mere eze nke alaeze ndị Kaldịa,

2nʼafọ mbụ nke ọchịchị ya, ka mụ onwe m, bụ Daniel ghọtara site nʼakwụkwọ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Jeremaya onye amụma, nke ga-emezu mgbe Jerusalem ga-anọ na mbibi iri afọ asaa.

3Nʼihi nke a, echere m Onyenwe anyị Chineke ihu, rịọ ya arịrịọ, site nʼekpere na arịrịọ amara, nʼibu ọnụ, na iyikwa akwa mkpe na ntụ.

4Ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị bụ Chineke m, ma kwupụta sị, “Onyenwe anyị, onye dị ukwuu, dị oke egwu. Onye na-edebe ọgbụgba ndụ nke ịhụnanya nke ndị hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile.

5Ma anyị emehiela meekwa ihe nʼadịghị mma megide gị. Anyị emeela ajọ omume, anyị enupula isi megide gị, gbakụtakwa iwu gị niile azụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.