Daniel 9

Ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị bụ Chineke m, ma kwupụta sị, “Onyenwe anyị, onye dị ukwuu, dị oke egwu. Onye na-edebe ọgbụgba ndụ nke ịhụnanya nke ndị hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile.

Daniel 9:4 (UKJV) And I prayed unto the LORD my God, and made my confession, and said, O Lord, the great and dreadful God, keeping the covenant and mercy to them that love him, and to them that keep his commandments;

2nʼafọ mbụ nke ọchịchị ya, ka mụ onwe m, bụ Daniel ghọtara site nʼakwụkwọ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Jeremaya onye amụma, nke ga-emezu mgbe Jerusalem ga-anọ na mbibi iri afọ asaa.

3Nʼihi nke a, echere m Onyenwe anyị Chineke ihu, rịọ ya arịrịọ, site nʼekpere na arịrịọ amara, nʼibu ọnụ, na iyikwa akwa mkpe na ntụ.

4Ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị bụ Chineke m, ma kwupụta sị, “Onyenwe anyị, onye dị ukwuu, dị oke egwu. Onye na-edebe ọgbụgba ndụ nke ịhụnanya nke ndị hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile.

5Ma anyị emehiela meekwa ihe nʼadịghị mma megide gị. Anyị emeela ajọ omume, anyị enupula isi megide gị, gbakụtakwa iwu gị niile azụ.

6Anyị e geghịkwa ndị ozi gị bụ ndị amụma ntị, bụ ndị gwara ndị eze anyị, na ndị ọchịchị anyị, na nna anyị ha, ma mmadụ niile bi nʼala anyị okwu nʼaha gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.