28Ebee ka anyị nwere ike ịga ugbu a? Ụmụnna anyị gara nyochaa ala ahụ emenyela anyị egwu. Ha sịrị, ‘Na ndị bi nʼala ahụ toro ogologo karịa anyị bụrụkwa ndị dị ike. Ha sịkwara na mgbidi e ji gbaa obodo ha gburugburu topuru ruo nʼeluigwe! Anyị hụkwara ụmụ Anak nʼebe ahụ.’ ”
29Ma agwara m unu sị, “Ka ụjọ ghara ịtụ unu, unu atụla ndị ahụ egwu.
30Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ, dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt,
31nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.”
32Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu,