Diuteronomi 10

Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị kewapụtara ebo Livayị ibu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na iguzo nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi na ikwupụta ngọzị nʼaha ya, dịka ha sị eme ruo taa.

Deuteronomy 10:8 (UKJV) At that time the LORD separated the tribe of Levi, to bear the ark of the covenant of the LORD, to stand before the LORD to minister unto him, and to bless in his name, unto this day.

6(Ụmụ Izrel gara ije site nʼolulu mmiri nke Bene Jaakan garuo Mosera, nʼebe ahụ ka Erọn nọ nwụọ, e lie ya nʼebe ahụ. Elieza, bụ ọkpara ya nọchiri ọnọdụ ya dịka onye nchụaja.

7Site nʼebe ahụ, ha gagidere ije ruo Gudgoda, sitekwa na ya ruo Jotbata, ala nke iyi na-asọ asọ juru nʼime ya.

8Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị kewapụtara ebo Livayị ibu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na iguzo nʼihu Onyenwe anyị ijere ya ozi na ikwupụta ngọzị nʼaha ya, dịka ha sị eme ruo taa.

9Ọ bụ nke a mere ndị Livayị enweghị oke maọbụ ihe nketa nʼetiti ndị Izrel ibe ha; Onyenwe anyị bụ ihe nketa ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu gwara ha.)

10Ugbu a, anọọla m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, dịka m mere nʼoge mbụ, Onyenwe anyị gekwara m ntị nʼoge ugbu a. Ọ bụghị ọchịchọ Onyenwe anyị ibibi unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.