Diuteronomi 12

Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.

Deuteronomy 12:28 (UKJV) Observe and hear all these words which I command you, that it may go well with you, and with your children after you for ever, when you do that which is good and right in the sight of the LORD your God.

26Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere Onyenwe anyị na nkwa gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta.

27Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja.

28Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.

29Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha.

30Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.