28Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.
29Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha.
30Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.”
31Efekwala Onyenwe anyị bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja.
32Lezienụ anya hụ na unu na-eme ihe niile bụ nke m nyere unu nʼiwu. Unu etinyela ihe nʼime ya maọbụ wepụkwa ihe site na ya.