Diuteronomi 16

Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị.

Deuteronomy 16:9 (UKJV) Seven weeks shall you number unto you: begin to number the seven weeks from such time as you begin to put the sickle to the corn.

7Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị.

8Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla.

9Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị.

10Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị.

11Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ nye gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, ndị ohu gị nwoke na nwanyị, ndị Livayị bi nʼobodo gị, ndị ọbịa, ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ bi nʼetiti gị. Meenụ nke a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị, nʼebe ahụ ọ họpụtara dịka ebe obibi nye aha ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.