Diuteronomi 16

Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla.

Deuteronomy 16:8 (UKJV) Six days you shall eat unleavened bread: and on the seventh day shall be a solemn assembly to the LORD your God: you shall do no work therein.

6karịakwa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara dịka ebe obibi nye ya ka i ga-anọ chụọ ya. Nʼebe ahụ ka ị ga-achụ aja ngabiga gị nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dachara, nʼoge mgbe dịka oge ụbọchị ahụ i sitere nʼIjipt pụta.

7Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị.

8Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla.

9Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị.

10Meenụ Mmemme Izu Ụka asaa nye Onyenwe anyị, bụ Chineke gị, site na inye onyinye afọ ofufu, nʼusoro ọtụtụ ngọzị Onyenwe anyị bụ Chineke gị ji gọzie gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.