5Ị gaghị achụ aja ngabiga nʼobodo ọbụla Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị,
6karịakwa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara dịka ebe obibi nye ya ka i ga-anọ chụọ ya. Nʼebe ahụ ka ị ga-achụ aja ngabiga gị nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dachara, nʼoge mgbe dịka oge ụbọchị ahụ i sitere nʼIjipt pụta.
7Ị ga-ahụ ya nʼọkụ riekwa ya nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke ga-ahọpụta. Nʼụtụtụ, ị ga-alaghachikwa nʼụlọ ikwu gị.
8Ụbọchị isii ka ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko, nʼụbọchị nke asaa, nweenụ mkpọkọta nye Onyenwe anyị Chineke gị, arụkwala ọrụ ọbụla.
9Gụpụta izu asaa site na mgbe ị malitere itinye mma iwe ihe ubi nʼukwu ọka guzoro eguzo nʼubi gị.