Diuteronomi 18

Ndị nchụaja bụ ndị Livayị, na ndị ebo Livayị niile agaghị enwe oke maọbụ ihe nketa ọbụla dịka ebo ndị ọzọ nʼIzrel. Ihe onyinye ịchụ aja niile e wetara nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ bụ ihe nketa ha.

Deuteronomy 18:1 (UKJV) The priests the Levites, and all the tribe of Levi, shall have no part nor inheritance with Israel: they shall eat the offerings of the LORD made by fire, and his inheritance.

1Ndị nchụaja bụ ndị Livayị, na ndị ebo Livayị niile agaghị enwe oke maọbụ ihe nketa ọbụla dịka ebo ndị ọzọ nʼIzrel. Ihe onyinye ịchụ aja niile e wetara nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ bụ ihe nketa ha.

2Ha agaghị enwe ihe nketa ọbụla nʼetiti ụmụ Izrel ndị ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị abụrụla ihe nketa nke ha dịka o kwere ha na nkwa.

3Nke ga-abụ oke ruuru ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ nọ, nʼebe ndị na-achụ aja, site nʼanụ ehi maọbụ atụrụ: a ga-enye onye nchụaja ubu aka ya, agba ya abụọ na afọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.