Diuteronomi 18

Ha agaghị enwe ihe nketa ọbụla nʼetiti ụmụ Izrel ndị ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị abụrụla ihe nketa nke ha dịka o kwere ha na nkwa.

Deuteronomy 18:2 (UKJV) Therefore shall they have no inheritance among their brethren: the LORD is their inheritance, as he has said unto them.

1Ndị nchụaja bụ ndị Livayị, na ndị ebo Livayị niile agaghị enwe oke maọbụ ihe nketa ọbụla dịka ebo ndị ọzọ nʼIzrel. Ihe onyinye ịchụ aja niile e wetara nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ bụ ihe nketa ha.

2Ha agaghị enwe ihe nketa ọbụla nʼetiti ụmụ Izrel ndị ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị abụrụla ihe nketa nke ha dịka o kwere ha na nkwa.

3Nke ga-abụ oke ruuru ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ nọ, nʼebe ndị na-achụ aja, site nʼanụ ehi maọbụ atụrụ: a ga-enye onye nchụaja ubu aka ya, agba ya abụọ na afọ ya.

4Ha ga-enwetakwa mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi unu, ya bụ, ọka mbụ unu, mmanya vaịnị ọhụrụ unu, mmanụ oliv unu na ajị mbụ a kpụchapụtara site nʼahụ igwe atụrụ unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.