Diuteronomi 18

Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a.

Deuteronomy 18:12 (UKJV) For all that do these things are an abomination unto the LORD: and because of these abominations the LORD your God does drive them out from before you.

10Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja,

11maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ.

12Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a.

13Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.

14Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.