11maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ.
12Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a.
13Ị ghaghị ịbụ onye zuruoke nʼụzọ niile nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị.
14Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ.
15Kama Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị.