14Mba ndị ị na-aga inweta ala ha bụ ndị na-ajụ ase site nʼaka ndị mgbaasị na ndị na-agba aja, ma Onyenwe anyị Chineke gị anabataghị na ị ga-eme ihe dị otu ahụ.
15Kama Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ka onye amụma nke dị ka m biliere unu site nʼetiti unu, site nʼetiti ndị unu bụ Izrel. Ọ bụ ya ka unu ga-aṅa ntị.
16Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu Onyenwe anyị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.”
17Nʼihi ya, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma.
18Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha.