Diuteronomi 18

Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha.

Deuteronomy 18:18 (UKJV) I will raise them up a Prophet from among their brethren, like unto you, and will put my words in his mouth; and he shall speak unto them all that I shall command him.

16Nʼihi na nke a bụ ihe gị onwe gị rịọrọ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼugwu Horeb, nʼụbọchị mkpokọta ahụ. I kwuru sị, “Anyị achọghị ịnụ olu Onyenwe anyị maọbụ hụ ọkụ ahụ dị egwu anya ọzọ, ka anyị ghara ịnwụ.”

17Nʼihi ya, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ihe ha kwuru dị mma.

18Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha.

19Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike.

20Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.