Diuteronomi 18

Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”

Deuteronomy 18:20 (UKJV) But the prophet, which shall presume to speak a word in my name, which I have not commanded him to speak, or that shall speak in the name of other gods, even that prophet shall die.

18Aga m eme ka onye amụma bilie nʼetiti ha, onye Izrel dịka gị. Aga m agwa ya ihe ọ ga-ekwu, okwu niile m tinyere nʼọnụ ya ka ọ ga-agwa ha.

19Onye ọbụla jụrụ ige ntị nʼokwu m niile nke onye amụma ga-agwa ha nʼaha m ka mụ onwe m ga-emesi ike.

20Ma onye amụma ọbụla sitere na nganga obi ya kwuo okwu nʼaha m, bụ okwu nke m na-ezighị ya ka o kwuo, ga-anwụ, maọbụ onye amụma ọbụla nke kwuru okwu nʼaha chi ndị ọzọ, onye amụma ahụ ga-anwụkwa.”

21I nwere ike ikwu nʼobi gị sị, “Olee otu anyị ga-esi mata na okwu e kwuru si nʼaka Onyenwe anyị nʼezie?”

22Otu a ka unu ga-esi mata, ọ bụrụ na ihe onye amụma buru nʼamụma nʼaha Onyenwe anyị emezughị, okwu ahụ esighị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịa. Ọ bụ okwu onye amụma ahụ chepụtara kwuo nʼonwe ya. Unu atụla ya ụjọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.