1Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile,
2mgbe ahụ, kewapụta obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche.
3Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ.
4Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya.