Diuteronomi 19

Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya.

Deuteronomy 19:4 (UKJV) And this is the case of the slayer, which shall flee thither, that he may live: Whoso kills his neighbour ignorantly, whom he hated not in time past;

2mgbe ahụ, kewapụta obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche.

3Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ.

4Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya.

5Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya.

6Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.