24Emesịa, Onyenwe anyị sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu.
25Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.”
26Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị,
27“Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.
28Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala,