1Mgbe i pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na i lee anya hụ na ndị iro gị nwere ọtụtụ ịnyịnya, ụgbọ agha na ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa gị, unu atụla egwu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị, onye ahụ mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼudo, nọnyeere gị.
2Tupu agha ebido, otu onye nchụaja ga-eguzo nʼihu ndị agha Izrel gwa ha okwu sị,
3“Geenụ ntị, unu ndị Izrel, taa, unu na-apụ ibuso ndị iro unu agha. Unu atụla egwu. Unu atụla ụjọ. Ka obi unu gharakwa ịda mba.