14Ma ụmụ nwanyị niile na ụmụntakịrị niile, anụ ụlọ niile na ihe nkwata niile nke ndị obodo ahụ ka ị ga-edebere onwe gị. Ị ga-ewerekwa ihe nkwata nke Onyenwe anyị Chineke gị nyere site nʼaka ndị iro gị mee ihe dị gị mma.
15Iwu ndị a metụtara naanị mmeso ị ga-emeso obodo ndị tere anya. O metụtaghị obodo ndị na-adịghị nʼime mba ndị a dị nso.
16Ma otu ọ dị, nʼobodo niile ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye gị dịka ihe nketa, o nweghị ihe ọbụla na-eku ume ị ga-ahapụ ndụ. Laa ihe niile na-eku ume nʼiyi.
17Ị ghaghị ịla obodo ndị a nʼiyi: obodo ndị Het na nke ndị Amọrait, nke ndị Kenan na nke ndị Periz, nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu.
18Ma ọ bụghị otu a, ha ga-akụziri gị ime ihe ndị ahụ niile rụrụ arụ ha na-eme mgbe ha na-efe chi ha dị iche iche, mee ka i mehie megide Onyenwe anyị Chineke gị.