14ọ bụrụ na nwoke a ekwutọọ nwaagbọghọ ahụ, mebie aha ya kwuo na nwaagbọghọ ahụ amatalarị nwoke tupu ha abụọ alụọ,
15nne nwaagbọghọ ahụ, na nna ya, ga-ewere ihe ga-egosi na nwa ha amabeghị nwoke gaa nʼihu ndị okenye obodo ahụ, nʼọnụ ụzọ ama.
16Nna nwaagbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye, “Enyere m nwoke a nwa m nwanyị dịka nwunye, ma ugbu a, ọ chọkwaghị ịlụ ya.
17Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, ‘Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.’ Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke.” Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ.
18Ndị okenye obodo ahụ ga-akpọrọ nwoke nyekwa ya ahụhụ.