1Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ atụrụ nwanna gị ka ọ na-akpafu, emela dịka a ga-asị na ị hụghị ya, jide ya, kpụlaara ya onye nwe ya.
2Ọ bụrụ na ị maghị onye nwe ya, maọbụ na nwanna gị ebighị nso, were ya laa nʼụlọ gị, hapụ ya nʼebe ahụ tutu onye nwe ya achọwa ya, mgbe ahụ ka ị ga-ewere ya nyeghachi ya.
3Otu a kwa ka ị ga-eme ma ị hụ ịnyịnya ibu nwanna gị, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla ị ga-atụtụta. Were ya debere onye nwe ya.
4Ọ bụrụ na ị hụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi nwanna gị ka ha dara nʼụzọ, elela anya nʼebe ọzọ, gaa nyere ya aka bulie ya.