5Nwanyị ekwesighị iyi uwe ndị ikom, nwoke agaghị eyikwa uwe ndị inyom. Nʼihi na ihe arụ ka ọ bụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.
6Ọ bụrụ na ị hụ akwụ nnụnụ tọgbọ nʼala, maọbụ nke dị nʼelu osisi, ọ bụrụkwa na ọ bụ nnụnụ nke nọ nʼelu ụmụ ya, maọbụ nʼelu akwa ya, ewerela nne na ụmụ nnụnụ ya.
7Hapụ nne nnụnụ ka ọ laa, ma were naanị ụmụ ya. Ihe ga-agakwara gị nke ọma nʼihi ya, ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
8Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.
9Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ.