7Hapụ nne nnụnụ ka ọ laa, ma were naanị ụmụ ya. Ihe ga-agakwara gị nke ọma nʼihi ya, ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
8Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.
9Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ.
10Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi.
11Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa.