23Ihe ọbụla nke i kwere na nkwa, jisie ike hụ na i mezuru nke ahụ dịka okwu gị si dị, nʼihi na ọ bụ onyinye afọ ofufu nye Onyenwe anyị Chineke gị.
24Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị.
25Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.