16Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.
17Ikpe ziri ezi ga-adịrị, ọ bụladị onye ọbịa na nwa mgbei, anarakwala nwanyị di ya nwụrụ anwụ uwe ya dịka ihe ibe.
18Cheta mgbe niile na i bụrụrị ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke gị gbapụtara gị, nʼihi nke a ka m ji enye gị iwu ndị a.
19Ọ bụrụ na i lefuo ukwu ọka ụfọdụ anya mgbe ị na-ewe ihe ubi nʼubi gị, alaghachila azụ nʼubi gị ịchịrị ha. Hapụrụ ya ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei, Onyenwe anyị Chineke gị ga-agọzi gị, ọ ga-emekwa ka ị baa ụba.
20Mgbe ị na-akụtusi mkpụrụ osisi oliv gị, ejeghachila azụ nʼalaka ọbụla inyochazi ya, ịchọpụta ma ị ghọtachaala mkpụrụ niile mịrị nʼelu ha. Hapụrụ ndị ọbịa na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ mkpụrụ ọbụla fọdụrụ.