Diuteronomi 24

Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.

Deuteronomy 24:16 (UKJV) The fathers shall not be put to death for the children, neither shall the children be put to death for the fathers: every man shall be put to death for his own sin.

14Emegbula nwa ogbenye mkpa na-akpa i goro ọrụ, ma onye ahụ ọ bụ nwa Izrel ma ọ bụkwanụ onye ọbịa bi nʼobodo gị.

15Kwụọ ya ụgwọ ya ụbọchị niile tupu anwụ adaa, nʼihi na ebe ọ bụ nwa ogbenye, obi ya dabeere nʼụgwọ ahụ ị ga-akwụ ya. Ọ bụrụ na i meghị otu a, ọ ga-akwa akwa kpọkuo Onyenwe anyị megide gị. A ga-agụkwara gị ya dịka mmehie.

16Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.

17Ikpe ziri ezi ga-adịrị, ọ bụladị onye ọbịa na nwa mgbei, anarakwala nwanyị di ya nwụrụ anwụ uwe ya dịka ihe ibe.

18Cheta mgbe niile na i bụrụrị ohu nʼala Ijipt, ma Onyenwe anyị Chineke gị gbapụtara gị, nʼihi nke a ka m ji enye gị iwu ndị a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.