14Enwela ụdị ihe ọtụtụ abụọ nʼụlọ gị, nke ukwu na nke nta.
15Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
16Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ.
17Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta.
18Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu Chineke.