Diuteronomi 25

Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta.

Deuteronomy 25:17 (UKJV) Remember what Amalek did unto you by the way, when all of you were come forth out of Egypt;

15Ị ghaghị inwe ezi ihe ọtụtụ na nke zuru ezu. Nke a ga-eme ka ndụ gị dị ogologo, dịkwa mma nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

16Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị kpọrọ onye ọbụla na-eme ihe ndị a asị, bụ onye ọbụla na-aghọ aghụghọ.

17Cheta ihe ndị Amalek mere gị nʼụzọ mgbe i si nʼIjipt na-apụta.

18Chetakwa na ha lụsoro gị ọgụ mgbe ike gwụrụ gị, mgbe ị dara mba, tigbuo ndị niile ji nwayọọ na-abịa nʼazụ. Ha atụkwaghị egwu Chineke.

19Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị mere ka i nwere onwe gị site nʼaka ndị iro gbara gị gburugburu, mgbe o mere ka i zuru ike nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, ime ka i nweta ya, ị ghaghị igbuchapụ ndị Amalek, ka ha bụrụ ndị a na-agaghị echetakwa ọzọ nʼokpuru eluigwe. Echefukwala ime otu a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.