Diuteronomi 26

Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị Izrel na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.”

Deuteronomy 26:15 (UKJV) Look down from your holy habitation, from heaven, and bless your people Israel, and the land which you have given us, as you sware unto our fathers, a land that flows with milk and honey.

13Ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Esitela m nʼụlọ wepụ oke ahụ dị nsọ, nye ha ndị Livayị, na ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ, dịka i nyere m nʼiwu, enupughị m isi maọbụ chefuo iwu gị ọbụla.

14Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu.

15Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị Izrel na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.”

16Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha.

17I kwupụtala taa na Onyenwe anyị bụ Chineke gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.