15Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị Izrel na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.”
16Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha.
17I kwupụtala taa na Onyenwe anyị bụ Chineke gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee.
18Taa kwa, Onyenwe anyị ekwupụtala na unu bụ ndị nke aka ya, dịka o kwere na nkwa, na ị ga-edebekwa ihe niile o nyere nʼiwu.
19O kwuru na ọ ga-emekwa ka i karịa mba niile o kere elu, nʼotuto, nʼaha, nsọpụrụ na ịja mma. Na unu ga-abụkwa mba dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke unu, dịka o kwere na nkwa.