Diuteronomi 26

Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha.

Deuteronomy 26:16 (UKJV) This day the LORD your God has commanded you to do these statutes and judgments: you shall therefore keep and do them with all yours heart, and with all your soul.

14Erighị m ihe ọbụla si nʼime ya mgbe m na-eru ụjụ maọbụ wepụ ihe ọbụla nʼime ya nʼọnọdụ adịghị ọcha m, ọ dịkwaghị nke m ji chụọrọ ndị nwụrụ anwụ aja. Egeela m ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke m, meekwa ihe niile i nyere m nʼiwu.

15Site nʼebe obibi nsọ gị dị nʼeluigwe ledata anya gị, gọzie ndị gị Izrel na ala a i nyere anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, dịka i kwere nna nna anyị ha na nkwa.”

16Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị iwu taa si gị gbaso ụkpụrụ ndị a na iwu ndị a. Lezie anya hụ na i ji obi gị niile na mkpụrụobi gị niile debe ha.

17I kwupụtala taa na Onyenwe anyị bụ Chineke gị, i kweekwala nkwa na ị ga-ege ya ntị, debe iwu ya niile, na ụkpụrụ ya niile, na ị ga-emekwa ihe niile ọ sị gị mee.

18Taa kwa, Onyenwe anyị ekwupụtala na unu bụ ndị nke aka ya, dịka o kwere na nkwa, na ị ga-edebekwa ihe niile o nyere nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.